2 Corinthians 12:15 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌezie, ọ na-atọ m ụtọ iwere onwe m na ihe nile m nwere nye unu, maka ọdịmma ndụ mmụọ unu, nꞌihi na ahụrụ m unu nꞌanya. Ma ọ na-adị m ka mgbe ịhụnanya m nꞌebe unu nọ na-adị ukwuu, mgbe ahụ ka ịhụnanya unu nꞌebe m nọ na-adị nta.
Igbo 2006
Ma mu onwem gēwere obi-utọ nile mefu ihe m'nwere kwe kwa ka emefusia mu onwem n'ihi nkpuru-obi-unu. Ọ buru na anamahubiga unu n'anya ókè kari, ànāhum n'anya nke-ntà kari?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼezie, ọ na-atọ m ụtọ iwere onwe m na ihe niile m nwere nye unu, nʼihi na ahụrụ m unu nʼanya. Ma ọ bụrụ na m hụrụ unu nʼanya karịa, ọ ga-adị mma ma unu hụ m nʼanya nke nta?