2 Corinthians 12:19 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma eleghị anya unu ga-anọ naeche na okwu ndị a nile m na-ekwu bụ nꞌihi na m chọrọ ka unu nabatakwa anyị. É,è! Kama ana m ekwu nke a nꞌihu Chineke, onye na-anụ okwu m na-ekwu, na ọ bụ nꞌihi na anyị chọrọ inyere unu aka ka anyị ji na-ede ihe ndị a. Ee, inyere unu aka iwuli mmụọ unu elu, ọ bụghị nꞌihi ọdịmma nke anyị.
Igbo 2006
Unu nēchè oge nile a na ayi nāgọpu onwe-ayi nye unu. Ọ bu n'iru Chineke nime Kraist ka ayi nēkwu. Ma ihe nile bu n'ihi iwuli unu elu dika ulo, ndi m'huru n'anya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu chere na ihe anyị na-eme oge niile ndị a bụ ịgọpụ onwe anyị nʼihu unu? Ọ bụ nʼihu Chineke ka anyị na-ekwu nke a nʼime Kraịst. Ndị m hụrụ nʼanya, ihe ndị a anyị na-ekwu bụ maka ọdịmma unu.