2 Corinthians 12:21 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ana m atụ egwu na mgbe m gaabịakwute unu ọzọ Chineke m ga-eme ka m weda onwe m ala nꞌihu unu, mee ka m kwaa akwa nꞌihi ụfọdụ nꞌime unu ndị mere ajọ ihe, ma ha achọghị ichegharị site nꞌihe ọjọọ ha mere, na nꞌihi ọtụtụ nꞌime unu na-adị ndụ rere ure, ndụ na-adịghị ọcha, ndụ ịkwa iko, na ndụ ọjọọ.
Igbo 2006
ma o nwere uzọ ọ bula, mb͕e m'gābia ọzọ, Chinekem gēwedam n'ala n'iru unu, m'ru-kwa-ra ọtutu madu újú n'etiti ndi mehieworo n'oge gara aga, ha echègharighi kwa n'adighi-ọcha na ikwa-iko na agu ikwa-iko nke ha mere.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ana m atụ egwu na mgbe m ga-abịakwute unu ọzọ, Chineke m ga-eme ka m weda onwe m ala nʼihu unu, mee ka m kwa akwa nʼihi ụfọdụ nʼime unu ndị mehiere na mbụ, ma ha achọghị ichegharị site nʼihe ọjọọ ha mere, na nʼihi ọtụtụ nʼime unu na-adị ndụ rere ure, ndụ na-adịghị ọcha, ndụ ịkwa iko, na ndụ ọjọọ.