2 Corinthians 12:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
A sị na m chọrọ ịnya isi, enwere m ọtụtụ ihe m pụrụ iji nꞌihi ya nyaa isi. Agaghị m abụkwa onye nzuzu ma m nyaa isi nꞌihi ha. Ma agaghị m eji ha nyaa isi nꞌihi na achọghị m ka onye ọ bụla gụọ m na m bụ mmadụ dị mkpa karịa ihe o ji anya ya hụ na ndụ m, na nke ọ nụrụ site nꞌozi ọma si m nꞌọnụ pụta.
Igbo 2006
N'ihi na asi na agamachọ inya isi, m'gaghi-abu onye nēnweghi uche; n'ihi na m'gēkwu ezi-okwu: ma esepurum aka, ka onye ọ bula we ghara igu ihe bayerem kari ihe ọ huru na abum, ma-ọbu nke ọ nuru n'ọnum.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
A sị na m chọrọ ịnya isi, agaghị m abụ onye nzuzu, nʼihi na aga m ekwu naanị eziokwu. Otu ọ dị, agaghị m anya isi ka onye ọbụla ghara ịgụ ọnọdụ m karịa ihe ọ hụrụ nʼime m, maọbụ karịa ihe ọ nụrụ nʼọnụ m.