2 Corinthians 13:1 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nke a ga-eme ya ugboro atọ m na-abịa ileta unu. Akwụkwọ nsọ ekwuola ya na a ga-esite nꞌama mmadụ abụọ ma ọ bụ atọ taa onye mere ihe ọjọọ ahụhụ. Nke a na-emekwa ya ịdọ aka na ntị nke ugboro atọ m na-adọ unu ugbu a m na-akwado ịbịakwute unu.
Igbo 2006
Nka bu ub͕ò nke-atọ m'nābiakute unu. N'ọnu ndi-àmà abua ma-ọbu atọ ka agēme ka okwu nile ọ bula guzo.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nke a ga-eme ya ugboro atọ m na-abịa ileta unu. Ọ bụ site nʼama mmadụ abụọ maọbụ atọ gbara ka a ga-eme ka okwu niile guzoro.