2 Corinthians 13:11 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ugbu a ụmụnna m nꞌime Kraịst, ka m jiri okwu ndị a mechie akwụkwọ ozi a. Na-aṅụrịnụ ọnụ! Na-etokwanụ eto nꞌime Kraịst. Werenụ okwu ndị a m gwara unu rụọ ezi ọrụ. Na-ebikwanụ nꞌudo. Ka Chineke onye hụrụ anyị nꞌanya, na onye na-enye anyị udo dịnyeere unu.
Igbo 2006
Nke fọduru, umu-nnam, nāṅurinu ọṅu. Ka anēme unu ka unu zu okè; ka anākasi unu obi; nātukwasinu uche-unu nile n'otù ihe; nādinu n'udo: Chineke nke ihu-n'anya na udo gānọye-kwa-ra unu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼikpeazụ ụmụnna m, na-aṅụrịnụ ọṅụ. Gbalịanụ nʼimezi ndụ unu ka o zuo oke, na-agbarịta onwe ume, werenụ otu obi na-eme ihe, na-ebikwanụ nʼudo. Chineke nke udo na ịhụnanya ga-anọnyekwara unu.