2 Corinthians 13:2 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Eburula m rị ụzọ dọọ ndị na-eme mmehie aka na ntị nꞌoge gara aga m bịakwutere unu. Ugbu a ana m adọkwa ha aka na ntị ọzọ, ha na ndị ọzọ nile, dị ka m mere mgbe ahụ m bịara, nꞌihi na mgbe m bịara ugbu a aga m ejikere ịta onye ọ bụla mehiere ahụhụ, o nweghị onye ga-ala nꞌefu.
Igbo 2006
Agwawom ha n'oge gara aga, anamebu kwa uzọ gwa ha, bú ndi mehieworo n'oge gara aga, na ndi nile fọduru, dika mb͕e m'nọ n'etiti unu ub͕ò nke-abua, ub͕u a kwa, mb͕e m'nānọghi n'etiti unu, si, na, ọ buru na abiam ọzọ, m'gaghi-eme ebere;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Mgbe m bịara leta unu nke ugboro abụọ, abaara m ndị niile dara iwu nʼoge gara aga na mmadụ ndị ọzọ mba, dọọkwa ha aka na ntị, ihu na ihu. Ugbu a m na-anọghị ya, ana m adọkwa ha aka na ntị ọzọ, ọ bụrụ na m bịa ọzọ hụ na ndị mehiere na mbụ echegharịghị, aga m emesi ha ike.