2 Corinthians 13:4 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụ ezie na a kpọgidere anụ ahụ ya na-adịghị ike nꞌelu obe, ma ugbu a ọ na-adị ndụ site nꞌike dị ukwuu nke Chineke. Anyị onwe anyị adịkwaghị ike nꞌanụ ahụ anyị dị ka Kraịst dị mgbe ọ nọ nꞌụwa, ma ugbu a anyị dị ndụ nweekwa ike, dị ka o nwere. Ike dị ukwuu nile Chineke nwere bụ nke anyị iji ịrụ ọrụ nꞌime unu.
Igbo 2006
n'ihi na esitere n'adighi-ike kpọgide Ya n'obe, ma O sitere n'ike Chineke nādi ndu. N'ihi na ayi onwe-ayi bu kwa ndi nādighi ike nime Ya, ma ayi gēsite n'ike Chineke n'ebe unu nọ so Ya di ndu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ ezie na a kpọgidere ya na-adịghị ike, ma ugbu a, ọ na-adị ndụ site nʼike dị ukwuu nke Chineke. Anyị bụkwa ndị na-adịghị ike nʼime ya, ma ozi anyị na-ejere unu na mmekọrịta anyị na unu, anyị ga-eso ya dị ndụ site nʼike nke Chineke.