2 Corinthians 13:5 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ya mere, ka onye ọ bụla lezie onwe ya anya nwapụta ụdị ndị ọ na-ebi. Ùnu bụ ndị Kraịst nꞌezie? Ùnu agafeela ule ahụ e ji anwapụta ndị bụ nke Kraịst nꞌezie? Leenụ onwe unu anya, Kraịst ò bi nꞌime unu? Ịrụ ọrụ nke ike ya ọ̀ na-apụta ìhè na ndụ unu? Ka ùnu na-ejegharị dị ka ndị Kraịst mgbe unu na-abụghị ndị ya nꞌezie?
Igbo 2006
Nānwanu onwe-unu, ma unu di n'okwukwe-ayi; nānwaputanu onwe-unu. Ma-ọbu ùnu amazughi onwe-unu, na Jisus Kraist nọ nime unu? ma-ọbughi na ọ bu ezie na unu bu ndi ajuru aju.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ka onye ọbụla nʼime unu nyochaa onwe ya, tulekwa omume ya, mara ma ọ ka kwudosiri ike nʼokwukwe ya. Ọ bụ na unu aghọtaghị na Jisọs Kraịst nọ nʼime unu? Ma ọ bụghị na unu enyochaala onwe unu hụ na unu emeghị nke ọma.