2 Corinthians 2:14 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma ekele dịrị Chineke, onye naedugharị anyị na-enye anyị mmeri, nꞌihi njikọ e jikọtara anyị na Kraịst. Ekele dịkwara Chineke onye na-eji anyị arụ ọrụ, ime ka onye ọ bụlạ nụrụ isisi ụtọ nke ozi ọma Kraịst.
Igbo 2006
Ma ekele diri Chineke, Onye nēdughari ayi n'ọṅù-agha nime Kraist mb͕e nile, nēsite kwa n'aka-ayi egosi isìsì nke ọmuma-Ya n'ebe nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ekele dịrị Chineke, onye na-edugharị anyị na-enye anyị mmeri, nʼihi njikọ e jikọtara anyị na Kraịst, onye na-eji anyị arụ ọrụ, ime ka onye ọbụla nụrụ isisi ụtọ nke oziọma ya.