2 Corinthians 3:1 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Okwu ndị a nile anyị na-ekwu o gosiri na anyị na-anya isi nꞌime onwe anyị? Dị ka ndị ọzọ na-eme, ọ̀ dị anyị mkpa iwetara unu akwụkwọ nke ga-akọwa ụdị mmadụ anyị bụ? Ka ọ̀ dị mkpa ka anyị rịọọ unu ka unu nye anyị akwụ-kwọ nke ga-ezi ndị ọzọ ịma mma anyị?
Igbo 2006
Àyi nāmalite ọzọ ime ka madu mara ayi? ma-ọbu ǹkpà akwukwọ-ozi ime ka madu mara ayi nākpa ayi inye unu ma-ọbu inara unu, dika ọ nākpa ufọdu?
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anyị na-ebido ito onwe anyị ọzọ? Ọ dị a mkpa anyị inye unu, maọbụ ịnata nʼaka unu akwụkwọ nkọwa iji too onwe anyị dịka ụfọdụ mmadụ ndị ọzọ si eme?