2 Corinthians 3:14 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma nꞌezie, ọ bụghị nanị ihu Mosisi ka e jiri akwa kpuchie, kama e mechiri obi ụmụ Izirel ruo taa. Nꞌihi na mgbe ọ bụla ụmụ Izirel gụrụ akwụkwọ nsọ, ọ na-adị ka e ji akwa kpuchie obi ha, nꞌihi na ha adịghị ahụ ma ọ bụ aghọta ihe ha gụrụ. Ma a pụrụ iwepụ akwa mkpuchi dị otu a, nanị ma ọ bụrụ na nwoke ọ bụla ekwere na Kraịst.
Igbo 2006
ma emere ka uche-ha ma etili: n'ihi na rue ubọchi ta n'ọgugu ọb͕ub͕a-ndu ochie otù ihe-nkpudo ahu nādigide, ebe anēkpugheghi na anēme ya ka ọ ghara idi irè nime Kraist.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Kama e mechiri obi ha ruo taa. Nʼihi na mgbe ọbụla ha gụrụ akwụkwọ ọgbụgba ndụ ochie ahụ, akwa mkpuchi ahụ na-anọgidekwa apụghị apụ nʼobi ha, nʼihi na ọ bụ naanị site nʼime Kraịst ka ọ ga-eji pụọ.