2 Corinthians 3:18 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma anyị nile ndị bụ ụmụ Chineke enweghị ihe mkpudo ọ bụla nꞌihu anyị. Anyị dị ka enyo na-egosi ndị mmadụ ebube Chineke. Mgbe Mmụọ Onyenwe anyị na-arụ ọrụ ya nꞌime anyị, ọ na-agbanwe anyị, ime ka anyị dịrị ka ya.
Igbo 2006
Ma ayi onwe-ayi nile ebe ayi were iru nke ekpupuworo ihe-nkpudo nēgosi ebube nke Onye-nwe-ayi dika enyo, anēnwogha ayi rue n'otù onyinyo ahu site n'ebube rue ebube, ọbuná dika anēnye ya site n'Onye-nwe-ayi, bú Mọ Nsọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anyị niile bụ ndị e wepụrụla akwa mkpuchi site nʼihu, na-egosi ebube nke Onyenwe anyị. A na-agbanwe anyị ịbanye nʼoyiyi ya site nʼebube ruo nʼebube, nke si nʼaka Onyenwe anyị, onye bụ Mmụọ.