2 Corinthians 3:2 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌezie, akwụkwọ ọ bụla adịghị anyị mkpa, nꞌihi na unu onwe unu bụ akwụkwọ e dere iji kọwaa ụdị mmadụ anyị bụ nke mmadụ nile nwere ike ịhụ na ịgụ. Nꞌihi na mgbe ndị mmadụ hụrụ mgbanwe dị na ndụ unu, ha ga-ahụ ọrụ ọma anyị rụrụ nꞌetiti unu.
Igbo 2006
Unu onwe-unu bu akwukwọ-ozi-ayi, nke edeworo nime obi-ayi, nke madu nile mara nāgu kwa;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Unu onwe unu bụ akwụkwọ ozi anyị nke e dere nʼobi anyị nke mmadụ niile maara ma gụọkwa.