2 Corinthians 3:7 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma iwu ahụ na-eweta ọnwụ ji ebube dị ukwuu bịa. Ebube ahụ dị nnọọ ukwuu mee ka ụmụ Izirel hapụ inwe ike ilegide Mosisi anya nꞌihu mgbe o si nꞌelu ugwu Sainai rịdata. Ma nꞌezie, ebube ahụ mesịrị bido ịgabiga.
Igbo 2006
Ma ọ buru na ije-ozi nke ọnwu, nke edeworo n'akwukwọ, nke atuworo n'elu nkume, biara n'ebube, nke mere umu Israel apughi ilegide iru Moses anya n'ihi ebube nke iru-ya; ebube nke anēme ka ọ ghara idi irè:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ bụrụ nʼije ozi ahụ nke na-eweta ọnwụ bụ nke e gbunyere nʼelu nkume ji ebube dị ukwuu bịa, nke mere na ụmụ Izrel apụghị ilegide Mosis anya nʼihu mgbe o si nʼelu ugwu Saịnaị rịdata nʼihi ebube nke ihu ya, bụ ebube nke na-agabiga agabiga,