2 Corinthians 4:13 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Anyị na-ekwupụta ihe anyị kweere na-atụghị ụjọ ọ bụla, nꞌihi na anyị kweere na Chineke, dị ka e si dee ya nꞌakwụkwọ Abụ Ọma sị, “Ekweere m na Chineke, ya mere aga m ekwupụtakwa ihe m kwenyere.”
Igbo 2006
Ma ebe ayi nwere otù mọ nke okwukwe ahu, dika ihe edeworo n'akwukwọ nsọ si di, Ekwerem, n'ihi ya ka m'kwuru; ayi onwe-ayi kwere kwa, ọ bu kwa n'ihi ya ka ayi nēkwu;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ebe ọ bụ na anyị nwere otu mmụọ nke okwukwe ahụ, dịka e si dee nʼakwụkwọ nsọ, “Ekweere m, ya mere m ji kwuo.” Anyị onwe anyị kwekwara, nʼihi nke a mere anyị ji na-ekwu,