2 Corinthians 4:15 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na ahụhụ ndị a anyị na-ata ugbu a, bụ nꞌihi ọdịmma nke unu. Nꞌihi na ọ bụrụ na ọtụtụ mmadụ ekwenye na Kraịst, ọtụtụ mmadụ ga-enyekwa Chineke ekele nꞌihi oke ịhụnanya ya. A gaesikwa otu a nye aha Chineke otuto karịa.
Igbo 2006
N'ihi na ihe nile di n'ihi unu, ka amara, ebe o riri nne site n'aka ndi ka n'ọnu-ọgugu, ka o we me ka ikele-ekele babiga ókè rue ebube nke Chineke.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ihe ndị a niile bụ maka nʼihi unu, ka ọ ga-abụ amara na-abawanye irute ọtụtụ mmadụ aka, ka o nwee ike na-abawanye inye ekele maka otuto nke Chineke.