2 Corinthians 4:2 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Anyị adịghị ejegharị naaghọgbu ndị mmadụ ime ka ha kwere. Anyị adịghị ejegharị na-agwa onye ọ bụla ka o kwere ihe anyị maara na akwụkwọ nsọ ekwughị. Anyị adịghị etinye aka nꞌihe ihere dị otu a. Kama dị ka a ga-asị na anyị guzo nꞌihu Chineke, anyị na-ekwu eziokwu, dị ka onye ọ bụla na-anụ olu anyị maara na anyị na-ekwu eziokwu.
Igbo 2006
kama ayi juru ihe-nzuzo nile nke nēweta ihere, ayi adighi-ejeghari n'aghughọ, ayi adighi-emeso kwa okwu Chineke n'uzọ itu-ntu; kama ayi ji ngosi nke ezi-okwu nēme ka akọ-na-uche nke madu nile n'otù n'otù mara ayi n'iru Chineke.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Anyị ahapụla omume nzuzo niile na-eweta ihere. Anyị ahapụla ụzọ aghụghọ niile, maọbụ iji okwu Chineke na-atụ asị. Kama site nʼikwupụta eziokwu ahụ ka ndị mmadụ were ezi akọnuche ha mata ụdị mmadụ anyị bụ nʼihu Chineke.