2 Corinthians 4:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na Chineke ahụ sịrị ka ìhè si nꞌime ọchịchịrị nwupụta, bụ Chineke ahụ mere ka ìhè ya nwuo nꞌime obi anyị, ka anyị nwee ike ịmata na ìhè ebube ahụ pụtara ìhè nꞌihu Kraịst, bụ ebube nke ya.
Igbo 2006
N'ihi na ọ bu Chineke, Onye siri, Ìhè gēsi nime ọchichiri nwuputa, bu Onye nwubàra nime obi-ayi, iweta inye-ìhè nke ọmuma nke ebube nke Chineke n'iru nke Jisus Kraist.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na ọ bụ Chineke ahụ sịrị, ka ìhè si nʼọchịchịrị chawapụta; bụkwa onye mere ka ìhè ya nwuwa nʼime obi anyị. Nke a ka o mere iji wetara anyị ìhè amamihe nke ebube Chineke nʼihu Kraịst.