2 Corinthians 5:1 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na anyị matara na mgbe anyị nwụrụ, pụọ site nꞌanụ ahụ anyị ndị a pụrụ ire ure, Chineke ga-enye anyị anụ ahụ ọzọ nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi nꞌeluigwe. Anụ ahụ ọ ga-enye anyị abụghị nke e ji aka mee, kama ọ bụ nke Chineke nꞌonwe ya kpụrụ.
Igbo 2006
N'ihi na ayi matara na asi na akwaturu ulo nke uwa, bú ulo-ikwū-ayi, ayi nwere ulo ewuru nke sitere na Chineke, ulo anējighi aka wu, di ebighi-ebi, n'elu-igwe.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na anyị ma nke ọma na mgbe e mebiri ụlọ ikwu nke anyị bi nʼime ya, bụ ụlọ nke ụwa a, anyị nwere ụlọ nke sitere na Chineke, ụlọ nke ejighị aka wuo, ga-adị ebighị ebi nʼeluigwe.