2 Corinthians 5:10 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na anyị nile ga-eguzo nꞌihu oche ikpe Kraịst, ka o kpee anyị ikpe. Mgbe ahụ onye ọ bụla nꞌime anyị, nꞌotu nꞌotu, ga-anata ụgwọ ọrụ dị ka ihe ọ rụrụ na-anụ ahụ ya mgbe ọ nọ nꞌime ụwa si dị.
Igbo 2006
N'ihi na aghaghi ime ka ayi nile puta ìhè n'iru oche-ikpé Kraist; ka ayi nile n'otù n'otù we nāghachi íhe esitere n'aru me, dika ihe onye ọ bula mere si di, ma ọ bu ezi ihe ma-ọbu ihe nādighi nma.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na anyị niile ga-eguzo nʼihu oche ikpe Kraịst, mgbe ahụ onye ọbụla nʼime anyị, nʼotu nʼotu, ga-anata ụgwọ ọrụ dịka ihe ọ rụrụ na-anụ ahụ ya mgbe ọ nọ nʼime ụwa si dị, maọbụ ezi ihe maọbụ ihe ọjọọ.