2 Corinthians 5:13 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ara ọ̀ dị anyị ikwu ihe dị otu a banyere onwe anyị? Ọ bụrụ na anyị dị ka ndị akọnuche ha na-ezughị oke, ọ bụ nꞌihi na anyị chọrọ iwetara Chineke otuto. Ọ bụrụkwa na ihe anyị na-ekwu na-egosi na anyị bụ ndị isi zuru oke, ọ bụkwa nꞌihi ọdịmma unu.
Igbo 2006
N'ihi na asi na ayi buru ndi anya nādighi nma, ọ bu n'ebe Chineke nọ; asi kwa na ayi nwere uche zuru okè, ọ bu n'ebe unu nọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụrụ na anyị amaghị onwe anyị, ọ bụ nʼihi Chineke, ọ bụrụ na anyị nwere uche zuruoke, ọ bụ nʼihi unu.