2 Corinthians 5:20 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ya mere, anyị bụ ndị na-anọchi anya Kraịst ijere ya ozi nꞌụwa. Chineke ji anyị naagwa unu okwu. Anyị na-arịọ unu dị ka ọ bụ Kraịst nꞌonwe ya na-arịọ unu. Biko, bịanụ ka unu na Chineke bụrụ enyi.
Igbo 2006
Ya mere ayi bu ndi-ukọ̀ n'ọnọdu Kraist, dika agāsi na Chineke nāriọ aririọ site n'aka-ayi: ayi nọ n'ọnọdu Kraist nāriọ unu, menu ka unu na Chineke di n'otù.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, anyị bụ ndị na-anọchi anya Kraịst ijere ya ozi nʼụwa. Chineke ji anyị na-agwa unu okwu. Anyị na-arịọ unu dịka ọ bụ Kraịst nʼonwe ya na-arịọ unu. Biko, bịanụ ka unu na Chineke dịrị nʼudo.