2 Corinthians 6:16 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Gịnị bụ ihe jikọtara ụlọ nsọ Chineke na arụsị? Nꞌihi na anyị onwe anyị bụ ụlọ nsọ Chineke dị ndụ. Ọ bụ Chineke kwuru sị, “M ga-ebi nꞌime ha, jegharịakwa nꞌime ha, m ga-abụkwa Chineke ha, ma ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke m.”
Igbo 2006
Ọzọ, òle nkwekọ ulo nsọ nke Chineke na arusi nēkwekọ? n'ihi na ayi onwe-ayi bu ulo nsọ nke Chineke di ndu; dika Chineke kwuru, si, M'gēbi nime ha, nējeghari kwa nime ha; M'gābu kwa Chineke nke ha, ha onwe-ha gābu kwa ndi nkem.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Gịnị bụ ihe jikọtara ụlọnsọ Chineke na arụsị? Nʼihi na anyị onwe anyị bụ ụlọnsọ Chineke dị ndụ. Dịka Chineke kwuru, “M ga-ebi nʼime ha. Jegharịakwa nʼime ha. M ga-abụkwa Chineke ha, ma ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke m.”