2 Corinthians 6:2 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma geenụ ntị nꞌihe Chineke na-ekwu, “Nꞌoge a na-anara mmadụ nke ọma ka akwa unu rutere m ntị. Ọ bụkwa nꞌụbọchị nzọpụta ka m nyeere unu aka.” Ya mere, ugbu a bụ oge Chineke chọrọ inyere gị aka. Taa ka Chineke jikeere ịzọpụta gị.
Igbo 2006
(n'ihi na Ọ nāsi, N'oge anānara madu nke-ọma ka M'nuru olu-gi, Ọ bu kwa n'ubọchi nzọputa ka M'yere gi aka: le, ub͕u a bu oge anānara madu nke-ọma; le, ub͕u a bu ubọchi nzọputa):
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na ọ na-ekwu, “Nʼoge m na-anara mmadụ nke ọma anụrụ m olu unu. Ọ bụkwa ụbọchị nzọpụta ka m nyeere unu aka.” Lee, ugbu a bụ oge a na-anabata mmadụ nke ọma, ugbu a bụ ụbọchị nzọpụta.