2 Corinthians 6:5 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
A na-eti anyị ihe otiti ọtụtụ mgbe. E tinyekwala anyị nꞌime ụlọ mkpọrọ dị iche iche. Ọtụtụ mgbe ka igwe mmadụ tikwara anyị ihe otiti. Anyị na-adọgbu onwe anyị nꞌọrụ. Ọtụtụ abalị anyị nọkwara nꞌime ịmụ anya. Anyị nọkwara ọtụtụ mgbe naerighị nri.
Igbo 2006
nime ihe-otiti, nime ulo-nkpọrọ, nime aghara, nime idọb͕u onwe-ayi n'ọlu, nime imuru-anya, nime obubu-ọnu;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
A na-eti anyị ihe otiti ọtụtụ mgbe. E tinyekwala anyị nʼime ụlọ mkpọrọ dị iche iche. Ọtụtụ mgbe ka igwe mmadụ tikwara anyị ihe otiti. Anyị na-adọgbu onwe anyị nʼọrụ. Ọtụtụ abalị anyị nọkwara nʼime ịmụ anya na-erighị nri,