2 Corinthians 6:9 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ụwa amaghị anyị, ma Chineke maara anyị. Ọ bụ ezie na anyị na ọnwụ na-anọ nso mgbe nile, ma lee anyị ka anyị dịkwa ndụ. A na-ata anyị ahụhụ, ma lee Chineke na-echebe anyị ka a hapụ igbu anyị.
Igbo 2006
dika ndi anāmaghi aha-ha, ma amazuru ayi; dika ndi nānwu anwu, ma le, ayi di ndu; dika ndi anēme ka ha muta ihe site n'ahuhu, ma adighi-eme ka ayi nwua;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ụwa amaghị anyị, ma a maara anyị. Ọ bụ ezie na anyị na ọnwụ na-anọ nso mgbe niile, ma lee anyị ka dịkwa ndụ. A na-ata anyị ahụhụ, ma lee anyị anwụghị.