2 Corinthians 7:1 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nkwa ndị a nile ka Chineke kwere anyị, ndị enyi m. Ya mere, ka anyị debe onwe anyị ọcha nꞌime ihe nile, ka ihe ọ bụla ghara imerụ ahụ anyị na mmụọ anyị. Kama ka anyị bie ndụ ịdị nsọ na ịtụ egwu Chineke.
Igbo 2006
Ya mere ndi m'huru n'anya, ebe ayi nwere nkwa ndia, ka ayi sachapu n'onwe-ayi nmeru nile nke aru na nke mọ, nēmezu idi-nsọ n'egwu Chineke.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ya mere, ndị enyi m, ebe anyị nwere nkwa ndị a niile, ka anyị debe onwe anyị ọcha nʼime ihe niile ọbụla nke na-emerụ ahụ anyị na mmụọ anyị. Ka anyị mezuo ịdị nsọ nʼịtụ egwu Chineke.