2 Corinthians 7:10 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na Chineke na-eji ihe naewute anyị enyere aka ime ka anyị site na mmehie anyị chegharịa. Ka ọ zọpụta anyị. Ya mere, anyị kwesịrị ịnabata ihe mwute dị otu a mgbe ọ bụla ha dakwasịrị anyị. Ma ihe naewute onye na-amaghị Kraịst abụghị ihe ga-eme ka o chegharịa, kama ọ bụ ihe na-ewetara ya ọnwụ.
Igbo 2006
N'ihi na nwuta dika Chineke chọrọ nālu ọlu nchèghari rue nzọputa, bú nchèghari nke anāpughi ikwa uta bayere ya: ma nwuta nke uwa nāluputa ọnwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na iru ụjụ otu Chineke chọrọ na-eweta nchegharị nke na-eduba mmadụ na nzọpụta, bụ nchegharị nke a na-apụghị ịkwa ụta banyere ya. Ma iru ụjụ dịka ụwa si eme na-eweta ọnwụ.