2 Corinthians 7:11 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Leenụ ihe Chineke rụpụtara site nꞌihe mwute dakwaịrị unu. Ugbu a unu abụrụla ndị ọ na-anụ ọkụ nꞌobi na ndị jikeere izi anyị na aka unu abụọ dị ọcha. Lee otu unu si zi iwe unu, otu unu si zikwa na ihe ahụ wutere unu. Lee otu unu si tụọ ụjọ ihe mmehie ahụ nwere ike iwetara unu. Leekwa otu unu si mee ihe nile igosi na unu kwagidere m. Leekwanụ otu unu si nye onye ahụ mere mmehie ahụ ntaramahụhụ ngwangwa. Unu egosila na aka unu dị ọcha nꞌokwu ndị a nile.
Igbo 2006
N'ihi na le, otù ihe a, na emere ka ihe wuta unu dika Chineke chọrọ, le ka ọ ra, bú inu-ọku-n'obi ọ luputara nime unu, e, le ka ngọpu ra, e, le ka iwe uku ra, e, le ka egwu ra, e, le ka ọgugu m'gusiri unu ike ra, e, le ka ekworo ra, e, le ka nkpeputa ra! N'ihe nile ọ bula unu mere ka amara unu na unu di ọcha n'okwu ahu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Leenụ ihe Chineke rụpụtara site nʼihe mwute dakwasịrị unu. Ugbu a, unu abụrụla ndị ọ na-anụ ọkụ nʼobi na ndị jikeere izi anyị na aka unu abụọ dị ọcha. Lee otu unu si zi iwe unu, otu unu si zikwa na ihe ahụ wutere unu. Lee otu unu si tụọ ụjọ ihe mmehie ahụ nwere ike iwetara unu. Leekwanụ otu unu si mee ihe niile igosi na unu kwagidere m. Leekwanụ otu unu si nye onye ahụ mere mmehie ahụ ntaramahụhụ ngwangwa. Unu egosila na aka unu dị ọcha nʼokwu ndị a niile.