2 Corinthians 7:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ewezugakwa ụzọ unu si gbaa anyị ume site nꞌịhụnanya unu nwere nꞌebe anyị nọ, a gbara anyị ume karịa site na nnabata unu nabatara Taitọs, na otu unu si mee ka mmụọ ya zuru ike mgbe ọ bịakwutere unu.
Igbo 2006
N'ihi nka akasiwo ayi obi: ma na nkasi-obi-ayi ayi ṅuribigara ókè nke-uku kari n'ihi ọṅù Taitọs, n'ihi na emewo ka mọ-ya zuru ike site n'ebe unu nile nọ.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼụzọ niile ndị a, anyị bụ ndị a gbara ume site nʼịhụnanya unu nwere nʼebe anyị nọ. A gbara anyị ume karịa site na ịhụ ọṅụ Taịtọs nʼihi nnabata unu nabatara, na otu unu si mee ka mmụọ ya zuru ike mgbe ọ bịakwutere unu.