2 Corinthians 7:14 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na tupu ọ hapụ anyị bịakwute unu, anyaara m isi nꞌihu ya banyere unu; ugbu a obi dị m ụtọ nke ukwuu nꞌihi na unu emeghị ka ihere mee m. Anyị ekwuola eziokwu nye unu. Ugbu a ịnya isi m nꞌebe Taitọs nọ egosila na anyị bụ ndị eziokwu.
Igbo 2006
N'ihi na asi na ọ di ihe m'nyaworo ya isi bayere unu, emeghi ka ihere mem; kama dika ayi gwara unu ihe nile n'ezi-okwu, otú a ka esi hu kwa na inya-isi-ayi, nke m'nyara n'iru Taitọs, bu ezi-okwu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na tupu ọ hapụ anyị bịakwute unu, anyara m isi nʼihu ya banyere unu; ugbu a, obi dị m ụtọ nke ukwuu nʼihi na unu emeghị ka ihere mee m. Anyị ekwuola eziokwu nye unu. Ugbu a, ịnya isi m nʼebe Taịtọs nọ egosila na anyị bụ ndị eziokwu.