2 Corinthians 7:4 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Enwere m ntụkwasị obi dị ukwuu nꞌebe unu nọ, ana m anyakwa isi nꞌihi unu. Unu agbaala m ume nke ukwuu. Unu emeela ka m ṅụrịa ọṅụ ọ bụladị nꞌime ahụhụ m.
Igbo 2006
Nkwuwa-okwum di uku, bú nke m'ji agwa unu okwu, inya-isim n'ihi unu di uku: nkasi-obi ezuwo ezu nimem, anamaṅuribiga ókè kari na nkpab͕u-ayi nile.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nkwuwa okwu m ji gwa unu okwu dị ukwuu; ịnya isi m nʼihi unu dịkwa ukwuu. Abụ m onye a gbara ume nʼebe ọ dị ukwu, nʼime ọnọdụ ahụhụ anyị niile, ana m aṅụrịbiga ọṅụ oke.