2 Corinthians 7:5 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na mgbe anyị bịaruru ala Masidonia, anyị enweghị izuike ma ọlị. Kama mkpagbu si nꞌaka nri na aka ekpe bịakwute anyị. Egwu jupụtakwara anyị obi.
Igbo 2006
N'ihi na mb͕e ayi bia-kwa-ra na Masedọnia, anu-aru-ayi adighi nfé ma-ọli, kama anākpab͕u ayi n'akuku nile; ilu-ọ̀gù di n'èzí, egwu di nime.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na mgbe anyị batara Masidonia, anyị enweghị izuike ma ọlị. Kama mkpagbu si nʼaka nri na aka ekpe bịakwute anyị, ọgụ nʼezi, egwu nʼime.