2 Corinthians 8:19 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ma ọ bụghị nanị nke a, kama ndị nzukọ Kraịst nile họpụtara ya iso anyị, na inyere anyị aka nꞌije ozi ịhụnanya a, nꞌụzọ ọ ga-esi wetara Onyenwe anyị otuto. Ije ozi a ga-ezipụta na anyị jikeere inyere ibe anyị aka.
Igbo 2006
ma ọ bughi nání otú a, kama nzukọ Kraist nile rọputa-kwa-ra ya ka ọ nēso ayi n'ije ije n'amara nka, nke ayi nēje ozi ya inye Onye-nwe-ayi otuto, na igosi obi di ọku nke ayi:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ọ bụghị naanị nke a, kama nzukọ họpụtara ya iso anyị, na inyere anyị aka dịka anyị na-ebu onyinye a, bụ ije ozi anyị na-eje nʼihi iwetara Onyenwe anyị otuto, na izipụta njikere anyị inyere ibe anyị aka.