2 Corinthians 8:23 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ọ bụrụ na onye ọ bụla ajụọ ajụjụ banyere Taitọs, sị ya na ọ bụ onye mụ na ya na-arụ ọrụ inyere unu aka. Sịkwanụ na ụmụnna anyị abụọ ndị ọzọ, ndị ya na ha so, bụ ndị na-anọchi anya nzukọ Kraịst, na ndị na-ewetara Kraịst otuto.
Igbo 2006
Ma ọ buru na onye ọ bula aju ajuju bayere Taitọs, ọ bu onye mu na ya nēnwekọ ihe, buru kwa onye mu na ya nālukọrọ unu ọlu; ma-ọbu umu-nna-ayi, ha bu ndi-ozi nke nzukọ Kraist, ha bu otuto nke Kraist.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma banyere Taịtọs, ọ bụ onye otu m nʼọrụ a, bụrụkwa onye mụ na ya na-arụkọ ọrụ nʼetiti unu. Ma banyere ụmụnna anyị ndị ọzọ a, ha bụ ndị na-anọchite anya nzukọ, na ndị na-ewetara Kraịst otuto.