2 Corinthians 8:3 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌezie, ọ bụghị nanị na ha nyere ihe ha nwere, kama ha nyere karịa ihe ha nwere. Ha nyekwara ihe ha nwere nꞌihi na ha chọrọ inye, ọ bụghị nꞌihi na mmadụ kwagidere ha ka ha nye.
Igbo 2006
N'ihi na ka ike-ha ra, dika m'nāb͕a àmà, e, kari kwa ike-ha, ka ha nyere dika ha zuputara n'onwe-ha,
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ana m agba ama na ha nyere dịka ike ha, ha nyekwara ọ bụladị karịa otu a tụrụ anya. Onyinye ha si nʼobi ha pụta.