2 Corinthians 8:7 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Unu babigara ụba oke nꞌihe nile unu nwere. Unu nwere okwukwe dị ukwuu, nweekwa ọtụtụ mmadụ ndị maara ikwusa ozi ọma nke ọma, na ndị maara ihe. Unu hụkwara anyị nꞌanya nke ukwuu ma gosikwa ịnụ ọkụ nꞌobi unu inye aka. Nꞌihi nke a anyị chọrọ ka unu gbasaa aka unu ịrụ ọrụ ịhụnanya a.
Igbo 2006
Ma dika unu babigara ókè n'ihe nile, bú okwukwe, na okwu, na ihe-ọmuma, na inu-ọku-n'obi nile, na ihu-n'anya unu huru ayi, lezienu anya ka unu babiga kwa ókè n'amara nka.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ebe unu babigara ụba oke nʼihe niile unu nwere, nʼokwukwe, na okwu, nʼihe ọmụma, na ịnụ ọkụ nʼobi, na ịhụnanya unu hụrụ anyị, lezie unu anya hụ na unu babigakwara ụba oke nʼamara nke inye ihe a.