2 Corinthians 9:10 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ma Chineke ahụ na-enye onye ọrụ ubi mkpụrụ nke ọ na-akụ nꞌubi ya, onye na-enyekwa ya nri nꞌoge owuwe ihe ubi, ga-enyekwa unu nile mkpụrụ dị unu mkpa, nke unu ga-eji kụọ mkpụrụ obi ọma. Ọ ga-emekwa ka mkpụrụ ndị a too eto, meekwa ka owuwe ihe ubi unu hie nne.
Igbo 2006
Ma Onye ahu Nke nwere inyezu onye nāgha nkpuru nkpuru-ya, Onye nwe-kwa-ra inyezu madu nri ka o rie, Onye ahu gēnyezu unu nkpuru-ọghigha-unu, me kwa ka ha ba uba, Ọ gēme kwa ka nkpuru ezi omume-unu rie nne kari:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma onye ahụ na-enye onye ọrụ ubi mkpụrụ nke ọ na-agha nʼubi ya, na-enyekwa mmadụ nri ọ ga-eri, ọ ga-enyekwa unu ihe niile dị unu mkpa, meekwa ka ụlọakụ unu jupụta na mkpụrụ. Ọ ga-emekwa ka mkpụrụ ezi omume unu baa ụba.