2 Corinthians 9:12 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Nꞌihi na ọrụ inyeaka nke unu na-enye abụghị nanị na unu gboro mkpa ụmụ Chineke, kama ọ bụkwa na unu na-eme ka ọtụtụ mmadụ nye Chineke ekele.
Igbo 2006
N'ihi na ije-ozi nke ifè-òfùfè a abughi nání ihe nēmezu ihe fọduru ndi nsọ inwe, kama o site-kwa-ra n'ọtutu ekele anēkele Chineke we babiga ókè;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na ije ozi nke ife ofufe a abụghị naanị nke igboro ndị nsọ mkpa ha, kama ọ bụkwa nke na-eme ka ekele ọtụtụ ndị mmadụ na-enye Chineke babiga ụba oke.