2 Corinthians 9:13 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ndị ahụ unu nyeere aka agaghị aṅụrị ọṅụ nanị nꞌihi onyinye unu nyere ha, kama ha ga-enye Chineke otuto, nꞌihi na unu esitela nꞌinyeaka unu gosi na ozi ọma Kraịst unu na-ekwusa, ma na-agbasokwa bụ eziokwu.
Igbo 2006
ebe ha ji nnwaputa nke ije-ozi a nēnye Chineke otuto n'ihi na edoro nkwuputa-unu n'okpuru ozi ọma Kraist, ya na n'ihi afọ-ofufo nke nnwekọ unu nēme ka ha na madu nile so unu nēnwekọ;
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi ije ozi a, nke unu sitere na ya gosi onwe unu dịka ndị kwesiri, ndị ọzọ ga-eto Chineke nʼihi irube isi unu nke dakọtara na nkwupụta unu banyere oziọma nke Kraịst, ya na onyinye afọ ofufu nke unu na-eme ka ha na ndị ọzọ niile soro unu nwekọ.