2 Corinthians 9:3 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Ugbu a ana m ezitere unu ụmụnna anyị ndị a ka e mee ka ịnya isi nke m nyara banyere unu ghara ịbụ okwu efu. Ma dị ka m gwara ha na unu ejikerela, achọrọ m ka unu jikere nye ha ihe unu chọrọ inye.
Igbo 2006
Ma ezitewom umu-nna-ayi, ka ewe ghara ime inya-isi ayi nānya bayere unu ka ọ buru ihe-efu n'akuku a; ka unu we buru ndi nọ na nkwadebe, dika m'nēkwuri:
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a, ana m ezitere unu ụmụnna anyị ndị a ka e mee ka ịnya isi nke m nyara banyere unu ghara ịbụ okwu efu. Ma dịka m gwara ha na unu ejikerela, achọrọ m ka unu jikere nye ha ihe unu chọrọ inye.