2 Corinthians 9:4 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Nꞌihi na ọ bụrụ na ndị Masidonia esoro m bịa hụ na unu ejikeghị ejike, ebe anyị naanya isi na unu ejikerela, ọ ga-abụru m ihe ihere, bụkwara unu ihe ihere, ebe anyị nwere afọ ojuju na unu gaejikere ejikere.
Igbo 2006
ka ewe ghara ime ka ihere me ayi onwe-ayi n'uzọ ọ bula (ka ayi ghara isi, unu onwe-unu) n'ihe a nke ayi dabere, ma asi na ndi Masedọnia gēsom bia, we hu na unu akākwadebeghi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nʼihi na ọ bụrụ na ndị Masidonia esoro m bịa hụ na unu ejikeghị ejike, ebe anyị na-anya isi na unu ejikerela, ọ ga-abụrụ m ihe ihere, bụkwara unu ihe ihere, ebe anyị nwere ntụkwasị obi na unu ga-anọ na njikere.