2 John 1:12 — Compare Translations

3 translations compared side by side

Igbo 1988
Otu ọ dị, enwere m ọtụtụ ihe m chọrọ ikwu, ma achọghị m ide ha dum nꞌakwụkwọ a, nꞌihi na ọ bụ nkwadebe m ịbịa ịhụ gị nꞌoge na-adịghị anya. Mgbe ahụ, anyị ga-anọ tulee okwu ndị a nile, nweekwa oge ime onwe anyị obi ụtọ.
Igbo 2006
Ebe m'nwere ọtutu ihe idegara unu n'akwukwọ, ezubeghm iwere akwukwọ na ink de ha: kama anamele anya na m'gābiaru unu aru, were kwa ọnu gwa unu okwu, ka ewe mezu ọṅù-unu.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọ bụ ezie na enwere m ọtụtụ ihe m chọrọ idere unu, ma achọghị m iji akwụkwọ na inki dee ha. Kama, ana m ele anya ịbịa leta unu ka mụ na unu kwukọrịta okwu ihu nʼihu, ka e sikwa otu a mee ka ọṅụ anyị zuo oke.