2 John 1:5 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Achọrọ m ichetara unu nke ọma nꞌebe a, ndị enyi m m hụrụ nꞌanya, iwu ahụ dị ochie Chineke nyere anyị site na mmalite. Iwu ahụ na-ekwu sị, ndị Kraịst kwesịrị ịhụrịta onwe ha nꞌanya.
Igbo 2006
Anamariọ kwa gi ub͕u a, nwanyi-nwe-madu, ọ bughi dika agāsi na anamedegara gi ihe ọhu enyere n'iwu n'akwukwọ, kama ọ bu nke ayi nwere site na mbu, ka ayi hurita onwe-ayi n'anya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ma ugbu a, ezi nwanyị, ọ bụghị iwu ọhụrụ ka m na-edere gị kama nke ahụ e nyere anyị site na mmalite. Ana m arịọ ka anyị hụrịta ibe anyị nʼanya.