2 John 1:6 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ọ bụrụ na anyị ahụ Chineke nꞌanya anyị ga-eme ihe ọ bụla ọ gwara anyị mee. Chineke agwakwala anyị site na mmalite sị anyị hụrịtaa onwe anyị nꞌanya.
Igbo 2006
Ihu-n'anya ahu bu kwa nka, ka ayi nējeghari dika ihe nile O nyere n'iwu si di. Ihe ahu enyere n'iwu bu nka, dika unu nuru site na mbu, ka unu nējeghari nime ya.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Nke a bụ ịhụnanya ahụ: ka anyị na-ejegharị nʼirube isi nʼiwu ya niile. Dịka unu si nụ ya site na mmalite, unu ahapụkwala ijegharị nʼime ya.