2 John 1:8 — Compare Translations
3 translations compared side by side
Igbo 1988
Ya mere lezienụ anya ka unu ghara iso ha ghọọ ndị na-agaghị anata ụgwọ ọrụ nke ndị nile rụrụ ezi ọrụ na-ele anya inweta. Kama rụzienụ ọrụ unu nke ọma, ka unu nwee ike ịnata ụgwọ ọrụ unu site nꞌaka Onyenwe anyị.
Igbo 2006
Lezienu onwe-unu anya, ka unu we ghara ila ọlu ayi luru n'iyì, kama ka unu we nata ugwọ-ọlu zuru ezù.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Lezienụ anya, ka unu ghara itufu ụgwọ ọrụ nke anyị dọgburu onwe anyị nʼọrụ maka ya, kama ka unu nata ụgwọ ọrụ unu nʼuju.