2 Kings 1:13 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ọ we ziga kwa onye-isi ọgu ndi-agha abua na iri nke-atọ, ya na ọgu ndi-agha abua na iri ya. Onye-isi nke-atọ nke ọgu ndi-agha abua na iri we rigo, bia b͕ue ikperè-ya n'ala n'iru Elaija, riọ ya amara, si ya, Onye nke Chineke, biko, ka ndum, na ndu ọgu ndi-orù-gi abua na iri ndia, di oké ọnu-ahia n'anya-gi.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ọzọkwa, eze zigara otu onyeisi agha na iri ndị agha ise ọzọ ka ha gaa jide Ịlaịja. Mgbe ndị agha a bịara hụ Ịlaịja, onyeisi agha ahụ rigoro nʼelu ugwu gbuo ikpere nʼala nʼihu Ịlaịja rịọọ ya amara sị ya, “Onye nke Chineke, biko, meere ohu gị na iri ndị agha ise mụ na ha so ebere.