2 Kings 10:19 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Ma ub͕u a, kpọnu ndi-amuma nile nke Beal, na ndi nile nēfè ya, na ndi-nchu-àjà-ya nile, ka ha biakutem; ka aghara ile anya nwoke ọ bula ma ahughi ya: n'ihi na enwerem àjà uku ichuru Beal; onye ọ bula elere anya ya ma ahughi ya, ọ gaghi-adi ndu. Ma Jihu mere ya n'aghughọ, ka o we me ka ndi nēfè Beal la n'iyì.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Ugbu a, kpọkọtaanụ ndị amụma Baal niile, ndị niile na-efe ya, na ndị nchụaja ya niile. Hụnụ na onye ọbụla nʼime ha bịara, nʼihi na a ga-eme oke mmemme ịchụ aja nye Baal. Onye ọbụla e lere anya ya nʼebe ahụ, ma a hụghị ya, agaghị adị ndụ.” Ma Jehu ji aghụghọ nʼihi ka ọ laa ndị a na-efe Baal nʼiyi.