2 Kings 11:8 — Compare Translations

2 translations compared side by side

Igbo 2006
Unu gānọ kwa eze buruburu, nwoke ọ bula na ihe-agha-ya n'aka-ya; ma onye nābata nime akuku-unu, ka eme ka ọ nwua: unu nọye-kwa-ra eze mb͕e ọ nāpu n'èzí, na mb͕e ọ nābà nime.
Igbo 2020 (Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a)
Doonụ onwe unu gburugburu eze, onye ọbụla nʼime unu jide ihe agha nʼaka ya. Onye ọbụla nke na-abịa nso ahịrị unu, ka e gbuo ya. Nọrọnụ eze nso ebe ọbụla ọ gara, mgbe ọ na-apụ nʼezi na mgbe ọ na-aba nʼime.”